FeaturedIgbo Culture

Otunba Segun Runsewe: Bobrisky ka ebola njọ

Views

Gọọmentị etiti agwala ndi na-eme njem nakwa ndi bịara njem nleta n’obodo a, ka ha kpachara anya ha maka Bobrisky, ọkachasị n’ihe gbasara ụlọ mposi.

Okwu a bụ nke so mkpesa enwetara gbasara Idris Okuneye, onye a mara dịka Bobrisky, onye ekwuru na ọ gara n’ụlọ mposi ụmụnwanyị na ọdụ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe nke dị n’Abuja.

Gọọmentị na-arịọ ndi Nigeria Medical Association, ka ha bịa kuziere ụmụnwanyị ihe egwu so ha na Bobrisky ike ụlọ mposi.

N’otu aka ahụ, Otunba Segun Runsewe, Onye ntụziaka National Centre for Arts and Culture, kwuru na Bobrisky bụ ọdachị nyere ahụ ike ndị mmadu. O kwuru na Bobrisky ka ọrịa Ebola njọ.

O kwukwara na ahụ ụmụnwanyị na-anata ọrịa ebe ọ dị ukwuu site n’ụlọ mposi. Ya mere, Bobrisky ga-eme ka ọrịa mụba n’ụlọ mposi ụmụnwanyị.

Ya mere, ọ na-adọ ndị mmadu aka na ntị ka ha kpachara anya ha.

Leave a Reply