Igbo News

Otu onye ara siri mee m obi ụtọ: Nwata nwaanyi na-efe ala nna ya

Views

Nwata nwaanyị na-efe ala nna ya nke aha ya bụ Jesam Ofem kwupụtara etu onye ara siri mee ka obi bụrụ ya sọ aṅụrị

Nwada a kwuru na onye ara biakwutere ya ma rịọ ya ego, o wee nye ya ego. Jesam kọwara na obi ụtọ juputara onye ara obi nke mere onye ara a jiri makụọ ya. Nwoke a isi na-adịghị mma were ego a zute nri ma laghachị azụ ikele Jesam. Jesam kwuru na nke a mere ya obi ụtọ nke ukwuu.

Mana ndi mmadu ebidola ikwu okwu maka omume a, ebe ụfọdụ kwadoro ya, ndi ọzọ na-akatọ ya.

N’akụkọ nke akọrọ na NYSC-diary na Instagram, a sin a Nwada Jesam na-aga ịnara clearance ikpeazụ mgbe onye ara biakwutere ya.

Ndi mmadu na-asị na onye ara a ekwesighi ịmakụ ya na-agbanyeghị etu onye ara siri dị. Ụfọdụ sịrị na ha ga-ekubi ume ma onye ara biaruo ha nso. Ndi ọzọ sị na ihe nwata nwanyị a mere di mma, ma kpee ka chukwu gọzie ya.

Leave a Reply