FeaturedIgbo News

Otu onye anwụọla, ebe mmadu anọ merụrụ ahụ n’ụlọ dara na Lagos

Views

Ụlọelu abụọ a ka na-arụ arụ adaala na Glover Court, Ikoyi, Lagos steeti, na Fraide, wee gbuo otu onye ma merụọ ndị ọrụ anọ na-arụ ọrụ ebe ahụ ahụ.

A chọpụtara na a ka na ebupusi ahịhịa na ihe ndị nọchiri ụzọ, iji mara ma o nwere ndị ọzọ ka nọ n’ime ụlọ ahụ.

Ndị City Round chọpụtara n’ụlọ a dara n’elekere anọ nke mgbede ma jide ụfọdụ ndị ọrụ n’ime ebe ahụ.

Ndị ọrụ Lagos State Emergency Management Agency , state ambulance na fire services zara oku a kpọrọ ha n’oge ma zọpụta ndị ọrụ anọ.

E kwuru na agwọla mmadu atọ n’ime mmadu anọ, ebe onye nke anọ ka nọ n’ụlọọgwụ.

Leave a Reply