FeaturedGossips

Nwaanyị nọ na di anwụọ ebe ọ gara ite ime

Views

Odz. Chinasa Odah, onye nne dị afọ iri abụọ na itolu, onye Inikiri Effum nke dị n’Ebonyi Steeti, anwụọla mgbe ọ ṅụchara ọgwụ maka ite ime.

E kwuru na ọbara gbagburu nwaanyị a na Sudan Hospital, na Satọde, iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọgọstụ.

Nnyocha emere gosiri na nwanyị a na-enwe mmekọahụ, ya na nwokorobia dị afọ iri abụọ na ise, onye a mara dịka Monday Mgbada. Nwokorobia tụwara ya ime were na-enye ya ọgwụ ite ime.

Mgbe nwaanyị a bidoro ịgba ọbara, di ya bụ Michael Odah bugara ya Sudan Hospital, ebe dọkịta kwuru na ọ bụ ọgwụ ọ ṅụrụ na-emebi akpa nwa ya.

Mgbe a jụrụ Chinasa maka ihe mere, o kwuru na ọ bụ Monday Mgbada na-enye ya ọgwụ ọ na-anụ. Ka ọ zachara ajụjụ, o kubie ume.

Ndi uwe ojii nke Ebonyi Steeti kwuru na-anwụchiela nwokorobia ma bido nnyocha.

Odz. Chinasa Odah bụ nwaanyi nọ na di, ji ụmụ anọ.

 

Leave a Reply