FeaturedIgbo News

Otu nwanyị akụgbuola nwa ya ma buuru ozu ya gbalaga n’Ondo

Views

Otu nwanyị ka e kwuru kụgburu nwa ya nke dị afọ anọ n’Akure, Ondo Steeti.

Ozi a natara kwuru na nwanyị a kụgidere nwa ya nwanyị ihe ruo mgbe ume na-adịghịzi nwata ahụ n’ahụ. O buuru nwa ahụ gawa ụlọ ọgwụ Ondo State, Akure. Nwata nwanyị a nwụrụ tụpụ ha erute ụlọ ọgwụ a.

Nọọsụ na-arụ n’ụlọ ọgwụ ahụ kọwara na nwanyị a kpọtara nwa ya n’abalị Wenesde. Mana mgbe a na-ele nwata ahụ, achọpụtara na ọ nwụọlarị tụpụ nwanyị ahụ akpọta ya.

Mgbe a gwara nwanyị a na nwata ya anwụọla, o mere ngwa ngwa kpọrọ nwa ahụ gbalaga. Mgbo niile agbara ka akwụsị nwanyị ahụ enweghi isi. Ndi ụlọ ọgwụ agwala ndi uwe ojii maka ihe a merenu.

Mz. Femi Joseph, onye uwe ojii na-ahụ maka ọha n’Ondo Steeti, kwuru na ebidola inyocha okwu mana ebe nsogbu dị na o nweghi ihe e dere n’akwụkwọ gbasara nwanyi na nwa ya n’ụlọ ọgwụ.

N’agbanyeghi nke a, o kwuru na a ga-ama ihe emere maka ya ka enwe ike mara ebe mmiri siri baa n’opi ụgbọgụrụ.

Leave a Reply