FeaturedIgbo News

Otu NUF akpọkuola ndị Gọvanọ South-East ka ha mezuo nkwa ha kwere na ntuliaka 2018

Views

Otu Ndigbo Unity Forum akpọkuola Gọvanọ South-East ka ha mezuo nkwa ha kwere ndị mmadụ tupu emee ntụli 2018.

Onyeisi otu a bụ Mz. Augustine Chukwudum, kpọrọ oku a na Mọnde n’Enugu Steeti.

Chukwudum kọwara na steeti ise ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ enwebeghi ihe ha mere kemgbe afọ ole na ole gara aga.

O kwuru na nkwa niile e kwere ndị bi n’ime obodo; ndị na-enweghi ụlọọgwụ, ezigbo mmiri, na ezi ụzọ, o nweghi nke ha mezuru.

O kwuru na ndị a na-ata ahụhụ maka agwa ọjọọ na nleghara anya ndị ndu ndị Igbo.

Leave a Reply