FeaturedIgbo News

Otu mba ụwa ajụla Buhari: PDP

Views

Ndị People’s Democratic Party(PDP), na Sọnde kwuru na otu mba ụwa ajụla Onyeisiala Muhammadu Buhari.

Ha kwuru na ha mere nkwupụta n’ihi otu e siri nabata ma kpaso Buhari agwa na Tokyo International Conference on African Development.

Onye ode akwụkwọ ndị PDP, Kola Ologbondiyan, kwuru na egeghi Buhari ntị n’ọgbakọ ahụ. Nke a mere Buhari ji buru naanị nkata efu na nkwa na-enweghi isi lọta.

Ologbondiyan kwuru na o nweghị onyeisi mba ụwa ọ bụla chọro itinye ego ya n’azụmahịa Naịjiria n’okpuru ọchịchị Buhari, n’ihi mpụ, izu ohi nke mejupụtara ọchịchị ya nakwa maka ntụli emere na Febuari, nke Buhari megharịrị mpụtara ya.

O kwuru na ebe ndị APC na-aṅụrị maka nkwa puku narị dollar atọ ($300,000), nke Onyeisi ala Japan kwere ha na nkwa, ndị Ghana emechiela ma binye aka n’akwụkwọ maka ahịa ụgbọala ndị Toyota ga-ebido na Ghana n’Ọgọstụ, 2020. O kwukwara na ndị Toyota binyekwara aka n’akwụkwọ maka azụmahịa n’Ivory Coast.

O kwuru na ndị ahịa ndị a họọrọ obodo ndị a maka ezi ọnọdụ akụnụba, ụdị nke dịbụ na Naịjiria ruo mgbe Buhari banyere n’oche ọchịchị.

PDP kwuru na kama Buhari ga na-agba mbọ ịbelata ọnọdụ ọjọọ nke Naijiria, ọ na-agagharị eleta ndị mmadụ na mba ụwa dị iche iche. Ka ọ dị ugbu a, Buhari enweghi ihe ọ mara ọ ga-eme maka nsogbu obodo a.

Leave a Reply