FeaturedIgbo News

Ka anyị ga-esi arụ ọrụ n’afọ ise na-abịa: Ụlọ ọba ego etiti

Views

Onye isi Ụlọ ọba ego etiti nke Nigeria (CBN) bụ Godwin Emefiele ekwuputala atụmatụ ha wepụtara iji arụ ọrụ n’afọ ise na-abịa n’ihu, ma kwe nkwa ikwalite akụ obodo Naijiria ruo percenti iri itolu na ise (95%) tụpụ afọ 2024.

Emefiele kwuru na ha eweputala atụmatụ ha ga eji kepụta ọrụ nde iri (10m) tụpụ e ruo afọ ise ọzọ. Nke a so na nkwa Buhari kwere maka ịkwụsị enweghi ego dị n’obodo site n’ikepụta ọrụ n’ụzọ di iche iche.

Site na ntuziaka Buhari, Emefiele kwuru na-aga enyere ndi ọrụ ugbo aka site n’inye ezigbo mkpụrụ nakwa ego ha ga-eji arụ ọrụ. A họpụtara ihe ubi iri ebe a ga-etinye ego. Ihe ubi ndi a gụnyere: osikapa, ọka, akpụ, koko, tomato, kotin, mmanụ nri, ọkụkọ, azụ nakwa anụmanụ ndi ọzọ eji eme ihe oriri. Ihe kpatara e jiri họrọ ihe ubi ndi a bụ ka ebelata ego e ji ebubata ihe ụfọdụ n’obodo ndi ọzọ.

Buhari kwuru na ọ bụrụ na-achọrọ ka Naijiria na-aga n’ihu, onye ọ bụla kwesịrị itinye aka ka ewezuga nrụrụ maka na-anyụkọọ mamiri, ọ gbaa ọfụfụ.

Leave a Reply