Igbo News

Orịa ọjọọ adakwasi Nwata

Views

Ụdịrị ọrịa dakwasịrị nwata a na-akpọ Maradona Mundyoli onye Tonga agwụla onye ọ bụla ike. Maradona dị afọ abụọ mgbe ọrịa ọjọọ dakwasịrị ya. Ndi ezinaụlọ si na ọ bụ amosu ka a na-ata ya mgbe afọ nwata a bidoro towe ebe aka na ụkwụ ya bidoro tawa.

Ha bu nwata a gaa University Teaching Hospital ebe ọ nọrọ ọnwa ole na ole tupu ahapụ ya ka ọlaa maka na ndi dibia bekee enweghi ike ịchọpụta ihe na-eme ka afọ nwata na-ebu ibu.

Nne nne Maradona, Oriaku Hachaamba, bụ onye na-elekọta ya ekwuola na eburula gaa ụlọọgwụ, ụlọekpere ma dibia ọdịnala mana o nweghi mgbanwe a hụrụ, naanị ihe fọdụrụ bụ ichewe oge nwata a ga-anwụ.

Afọ nwata a naghi ekwe ya aga ije, ya mere o na-anọ otu ebe ugbu a. Ndi mmadu na ndi agbataobi na-arịọ ka enyere nwata a aka.

Leave a Reply