FeaturedIgbo News

Onyeisi ala Buhari na-achọ nkwado ụlọ ọmeiwu maka Ijeri narị iri nke Kogi steeti

Views

Onyeisi ndị omeiwu nke Naijiria, Ahmed Ibrahim Lawan, na Tuzde kwuputara na Onyeisi ala Muhammadu Buhari na-arịọ ka ha kwado ijeri narị iri maka Kogi steeti.

Buhari, n’akwụkwọ ozi o zigara ndị omeiwu, kwuru na ego a bụ ego emefuru n’ọrụ arụchitere gọọmentị etiti nke ndị Kogi na-achọ ka akwụghachi ha.

O kwukwara na steeti iri abụọ na atọ ndị ọzọ, ndị mefuru ego na nnọchite anya gọọmentị etiti enwetala ego ha mefuru mana Kogi steeti, enwetabeghi nke ha.

Onyeisi ndi omeiwu, Ahmed Lawan wegara akwụkwọ ozi na otu ndị omeiwu na-ahụ maka ego mbite na ụgwọ eji eji. Ndị a ga-ewepụta ihe ha kpatara gbasara okwu a n’izu abụọ na-abịa n’ihu.

 

Leave a Reply