FeaturedIgbo News

Onye uwe ojii amala mmadu itolu mma n’Ondo

Views

Onye uwe ojii, onye a matara dịka Taiwo Orisadare, mara mmadu itolu mma n’ụlọ oriri dị n’Akure, Ondo Steeti. Onye uwe ojii ka e kwuru na ọ ṅụjuru mmanya afọ tụpụ ọ kpaa agwa ọjọọ.

Onye akaebe nọ mgbe ihe a mere kwuru na onye uwe ojii bidoro ịkparị ndi mmadu mgbe ọ ṅụchara mmanya. O kwukwara na ndi mmadu gwara onye uwe ojii a ka o wetuo obi mana o kweghi. Ọ mara mmadu itolu mma tụpụ ndi mmadu ejidenwuo ya.

E kwukwara na ndi ọ mara mma nọ n’ụlọ ọgwụ dị n’Akure ebe a na-eleta ha. O nweghi onye nwụrụ n’ihe a merenụ.

Onye uwe ojii na-ahụ maka ọha na Ondo Steeti, Femi Joseph, kwenyere n’ihe merenụ, ma kwuo na onye uwe ojii na ndi na-aṅụ mmanya n’ebe ahụ lụsara onwe ha ọgụ. O kwukwara na Orisadare, onye nke emerụkwara ahụ, nọ n’ụlọ ọgwụ ugbu a.

Joseph kwuru na ha enyochawala okwu a. O kwuru na ha ga- emesi onye uwe ojii ike ma ọ bụrụ na ọgụ a si ya n’aka.

Leave a Reply