Igbo News

Onye uwe ojii akụgbuola otu nwoke n’Enugu

Views

Ozi a natara kwuru na otu onye uwe ojii akụgbuola nwokorobia ụnyahụ. Onye uwe ojii a ka asịrị na ọ na-elekọta ụlọ akụ mgbe ihe a mere. Ọ kụrụ nwoke a osisi n’isi n’ihi esemokwu a na-amaghị ihe kpatara ya n’etiti nwokorobia a na otu nwanyị n’ebe a na-ewe ego n’ụlọ akụ.

Mkpa mkpa kpara n’ụlọ akụ ‘First Bank’ nke dị na Nkwo-Inyi na Oji LGA n’Enugu Steeti n’ụbọchị Tuzde. Dịka out onye nlere anya bụ Chinonso Udoye siri kwuo, nsogbu a bidoro mgbe nwokorobia na otu nwaagbọghọbia bidoro ise okwu, onye uwe ojii no ebe ahụ kwesịrị ikpezi okwu a hapụrụ ime otu a ma tụtụrụ nnukwu osisi dị n’ala ma kụọ nwoke a n’isi. Nwokorobia dara n’ala ma nwụọ ozigbo.

Nwokorobia bụ onye Umuchime nke dị n’Enugwu-Inyi nke Enugu Steeti.

Oge eruola mgbe a ga-akwụsị ụdị mmekpa ahụ a ndi uwe ojii na-enye n’obodo.

Leave a Reply