FeaturedIgbo News

Onye uwe ojii agbagbuola nwuye ya ma gbuo onwe ya na Lagos

Views

Onye uwe ojii a na-amatabeghi onye ọ bụ, onye a gbakwunyere na Highway Patrol Team nke Lagos State Police Command, egbuola onwe ya dịka ọ gbagbuchara nwunye ya na Prison Barracks dị n’ụzọ Awolowo.

Ndị Punch Metro kwuru na di na nwunye na-alụ ọgụ na Sọnde mgbe onye uwe ojii gbagburu nwunye ya.

Onye bi n’ebe ihe mere, Segun, kwuru na iwe were onye uwe ojii mgbe nwunye ya gwara ya ọ chọghịzi ịbụ nwunye ya.

O kwuru na nwoke a pụrụ n’ezi, mechaa jiri egbe bata n’ime ụlọ ka nkeji ole na ole gachara. Ọ chụpụrụ ụmụ ha ma gbaa nwunye ya egbe n’ụkwụ nakwa n’obi. O mechara gbagbuo onwe ya.

Onye uwe ojii na-ahụ maka ọha, Bala Elkana, kwuru na ha bịara ebe ahụ mgbe ha nwetara ozi. Ma tụpụ ha erute, ndị ọchịchị prison ebugala ha ụlọọgwụ.

Ha abụọ nwụrụ mgbe ebutere ha n’ụlọ ọgwụ.

 

Leave a Reply