Igbo News

Onye omeiwu arịọla ndi Naijiria

Views

Onye omeiwu nke na-anọchi anya Adamawa North bụ Elisha Abbo arịọla ndi Naijiria na ụmụnwanyị niile maka otu o siri kụọ nwanyi ihe n’ụlọ ahia n’Abuja dika egosiri n’ihe onyonyo.

Ọ bụ n’ọgbakọ ndi nta akụkọ nke emere n’Abuja ka Elisha rịọrọ ndi Naijiria ka ha gbaghara ya ma kwuo na ya agaghị akpa ụdị agwa ahụ ọzọ. Ọ rịọrọ Bibra bụ nwanyị ọ mara akanti na ezinaụlọ ya ka ọ gbaghara ya.

Dika o kwuru, Abboh amatụbeghi mmadu akanti n’ihi na ọ bụ onye na-efe chineke. Ọ siri na ụdị ihe a agaghi eme ọzọ.

Leave a Reply