Igbo News

Onye nkuzi dinara nwa dị afọ iri na abụọ n’ike ma tụwa ya ime n’Adamawa

Views

Nwa dị afọ iri na abụọ bụ onye e kwuru na onye nkuzi ya dinara n’ike ma tụwa ya ime na Namtari, Yola South LGA, Adamawa Steeti.

Adamawa State Commandant nke ndi Nigerian Security and Civil Defence Corps (NSCDC), Abdullahi Nuruddeen, kwuru na-anwụchiela onye nkuzi a, Nathan Yusuf.

Nurudeen kwuru na Nathan Yusuf bụ onye nkuzi na Gurel Primary School, onye ji ọnụ ya kwuputa na o dinara nwata akwụkwọ ahụ mgbe e jidere ya. Nathan kwukwara na o nyere nwa ahụ ọgwụ mmiri a na-akpọ codeine tụpụ ọ dina ya.

Nurudeen kwuru na a ga-akpọpụ onye nkuzi a ụlọ ikpe ma ha mecha nnyocha.

Bashir Tahir, onye otu Non-Govermental Organization nke a na-akpọ Hope Centre, kwuru na ha na-eleta nwata akwụkwọ a ma na-enye ya nkwado otu o kwesiri.

Onye nkuzi a, Nathan Yusuf rịọrọ mgbaghara ma kwuo na ọ ga-azụ nwa ebu n’afọ mgbe amụpụta ya.

Leave a Reply