Igbo News

Onye a na-enyocha maka wayo intaneti akwadoghi ntuli m: Ihedịọha

Views

Onye enyemaka Gọvanọ Ihedịọha, Izuchukwu Akwarandu kwuru na Mọnde na Chịka Ọdịonyenma, onye FBI hụtara dịka onye wayo, akwadoghị ntuli ya n’Imo Steeti.

Ọdịonyenma so na mmadu iri asaa na asaa ndi Federal Bureau Investigation na-enyo enyo dịka ndi wayo ịntanetị.

 N’okwu Akwarandu, ọ kọwara na ndi na-ejiko Gọvanọ Ihedịọha na Ọdịonyemma bu ihe ọjọọ n’obi. O kwuru na mgbe Ihedịọha nyere Odionyemma ọkwa ọhụrụ, na o nwebeghi onye ma na ọ bụ onye wayo. Lee leta Ihedịọha degara Ọdịonyemma:

O kwukwara na o nweghi ihe jikọrọ Ihedịọha na Ọdịonyemma n’ihe gbasara igwu wayo.

Akwarandu kwuru na Ihedịọha gara emume nwokorobia haziri n’ihi na e si n’emume ndi ahụ bulie ụfọdụ mmadu elu nakwa maka na Ọdịonyemma bụ nwaafọ Imo Steeti.

Leave a Reply