FeaturedIgbo News

Ọkụ gbara ụlọọrụ dị na Lagos, na ụlọahịa dị na Balogun nakwa na Dosunmu

Views

Ọkụ gbara ụlọọrụ na-emepụta chin-chin nke otu Didaskalos Vado nwe nakwa ụlọahịa dị n’ahịa Balogun na Dosunmu, na Lagos, na Tuzde.

Ndị Punch Metro kwuru na ọ bụ ọkụ elektik mere ụlọọrụ na-emepụta chin-chin jiri nwuru ọkụ. Mana achọpụtabeghi ihe butere ọkụ ọgbụgba na ahịa abụọ ndị ọzọ, ebe ọtụtụ ngwa ahịa lara n’iyi.

N’ebe a na-eme chin-chin, e kwuru na ọkụ a bidoro n’elekere asaa nke mgbede ma ndị na-emenyụ ọkụ bịara n’oge ma menyụọ ya bụ ọkụ.

N’ahịa Balogun, ndị na-emenyụ ọkụ na ọkụ ka na-alụ mgbe o jiri ọkara gafee elekere iri. E kwuru na otu akụkụ ụlọahịa dara ma merụọ onye uwe ojii ahụ.

N’otu aka ahụ, ụlọ dị n’ime ahịa Dosunmu gbara ọkụ. Mana ndị mmenyụ ọkụ were ọnọdụ ma menyụọ ya bụ okụ.

Lee ihe eserese ebe a:

Leave a Reply