FeaturedIgbo News

Video: Ọkụ gbara n’Ọnitsha na ihe so ya n’azụ

Views

Nnukwu ụgbọala bu mmanụ ọkụ nke a na-akpọ Premuim Motor Spirit (PMS), bụ nke kpọnyere isi na ahụ aja nke ụlọọgwụ Toronto, Upper Iweka, Onitsha, mgbe onye ọkwọ ụgbọala na-ejikwataghinwuzi ụgbọala ya.

Mmanụ ọkụ nke nnukwu ụgbọala bu kwafuru ebe niile, site na ọwa mmiri ruo okirikiri Ọchanja. Nke a mere ọkụ jiri nwuru na ahịa Ọchanja nakwa na Ziks avenue, wee mebisie ihe enwe ndị mmadu ma laa ndu n’iyi. Lee ihe nkiri ya ebe:

E kwuru na ọkụ a gbara ihe karịrị awa abụọ, mana o nweghi enyemaka ndị a nwetara. Ndị na-ahụ maka ọkụ ọgbụgba, fire service agents, e nweghi nke bịaranụ.

E nwetakwara ozi na ndị fire service si Delta mechara bịa, mgbe ihe niile mebichagoro.

Lee ihe eserese ndị a nke na-egosi ndu na akụ lara n’iyi:

Leave a Reply