FeaturedIgbo News

Ọkụ eregwoo ahịa Katangowa na Lagos

Views

N’isi ụtụtụ a bụ Mọnde ka e nwetara ozi na ọkụ enwurula n’ahịa Katagowa nke dị n’Agbado/Okeodo, Lagos steeti.

Ọkụ a bidoro mgbe o jiri nkeji iri na ise gafee elekere atọ nke ụtụtụ ma mebisie ụlọ ahịa ebe a na-ere akwa.

Ndị mgbanyụ ọkụ na Lagos State Emergency Management Agency bịara ebe ahụ mgbe chi fosara.

N’otu aka ahụ, ndi uwe ojii Okeodo Divisional Headquaters biakwara ebe ahụ igbochi ndi mmadu izuru ngwa ahịa ndị mmadụ.

Leave a Reply