Gossips

Ọkụ eregbuola mmadu iri na itolu ihe mberede mere n’Ondo

PIC.15. SCENE OF AN ACCIDENT AT BRT BUS STOP, FADEYI, ON IKORODU ROAD IN LAGOS ON FRIDAY (3/6/16). 4009/03/6/2016/WAS/CH/NAN
Views

Ihe mberede okporo ụzọ dakwasiri mmadu iri na itolu n’ụbọchị Satọọdee n’ụzọ awarawa Akure-Owo, Ondo Steeti. Onye kwuputara nke a bụ Femi Joseph bụ ‘Public Relation Officer’ nke ndi uwe ojii n’Ondo Steeti. O kwukwara na e tinyela ozu ndi n’ụlọ ozu nke ụlọọgwụ Ondo Steeti.

Ọ kọwara na ụgbọala nke ihe mberede a mere bu mmadu iri na asatọ were na-aga Abuja. Nnukwu ụgbọala na-achọ izere ụzọ ọjọọ kụrụ ụgbọala a, o wee nwuru ọkụ. O nweghi otu onye siri na ya pụta.