FeaturedIgbo News

Oke ihe isi ike dị na Naijiria na-agba m anya mmiri: Osinbanjo

Views

Onye na-esote onye isi ala Naijiria bụ Okz. Yemi Osibanjo kwuru na mkparịta ya na ndi Harvard Business School nwere na ụdị ihe isi ike dị n’ala Naijiria anaghi ekwe ya hie ụra n’abalị. Ha nwere mkparịta ụka n’abalị Tuzde na Lagos.

Osibanjo kwuru na ndi na-ata ahụhụ karichaa bụ ndi tunyere ha na ntụli aka e mere. Ọ gara n’ihu kwuo na nkwa niile gọọmentị ha kwere bụ ndi ha ga-emezu n’oge na-adịghị anya.

N’okwu nke ya, Osibanjo kwuru:

‘Ọ ga-amasị m ịhụ ka ala Naijiria bụrụ nnukwu obodo ụlọ ọrụ dị iche iche dị n’ime ya, ebe ndi ogbenye na-adịghị ọtụtụ’.

Osibanjo kwuru na gọọmenti a na-agba mbọ ịhụ na ha wepụtara iwu di iche iche ga-eme ka ndi niile bụ ndi ogbenye bụrụ ndi eletara nke ọma.

Leave a Reply