FeaturedIgbo Culture

ỌJI: ka esi eleta ọbịa mgbe mbu na otu ọ dị ugbu a

Views

Ịleta ọbịa bụ otu ihe e jiri mara ndi Igbo. Nke a mere e ji nwee ụdị okwu a, ‘akọkwalam ọnụ ọjị’, ma ọ bụrụ na onye a biara na nke ya enweghi ihe ọ wepụtara. Na mgbe ochie, mgbe ọ bụla nwoke chọtara nwoke ibe ya, ọ na-ewepụta ọjị Igbo were nye onye biara na nke ya. Mgbe ụfọdụ, a na-enyekwa nzu, mmanya ngwọ, anụ amịkpọrọ amịkpọ ma ọ bụ nri. N’ebe ụmụnwanyị nọ, nleta a na-enye nwaanyi ọbịa bụ nri, mmanya ma ọ bụ onyinye ndi ọzọ’

Ụdị nleta a na-enye ọbịa gbadoro ụkwụ na ụdị onye ọ bụ ma ọ bụ emume a na-eme. Ọjị Igbo bụ ihe ụmụnwoke na-enyekarị ibe ha. Ọjị bụkwa mkpuru a na-akwanyere ugwu n’omenala Igbo. Ọ bụghị ihe a na enye ụmụaka ma ọ bụ ụmụnwanyi n’ọgbakọ. Ọ bụ nwoke bụ okenye na-awa ọjị ma ọ bụrụ na agọchaa ya. Ọjị na-agbakari ibe dị iche iche; o nwere ike igba abụọ, atọ, anọ, ise dgz. Iberibe ole ọjị gbara nwere ihe ọ pụtara n’ala Igbo;

  •  Ọjị gbara otu ibe bụ Ọjị ogbi, Ọ pụtaghị ezi ihe
  • Ọjị gbara mkpị abụọ n’ agla Igbo apụtaghị ezi ihe
  • Ọjị gbara  atọ, Ọjị Ikenga, bụ ezigbo Ọjị.
  • Ọjị gbara  anọ na-egosi ahịa anọ ndị Igbo; Eke, Orie, Afọ, Nkwọ. Ọ bụ ezigbo Ọjị
  • Ọjị gbara ise were dịrị gaba bụ ezigbo Ọjị na-egosi agamnihu

Enwere ọtụtụ uru ọjị bara na mgbe ochie:

  • E ji ya eleta ọbịa
  • E ji ya ekpe ekpere
  • E ji ya alụ nwaanyi,
  • E ji ọjị edozie esemokwu,
  • E ji ya aṅụ iyi

dgz.

Ka ọ dị ugbu a, ugwu a na-enye ọjị abụrụla ihe e chefuru echefu; a na-atazi ya otu na mgbe ọmasịrị onye ọ bụla. Ụfọdụ ji ọjị achụ ụra. Mana mgbe ọ bụla a na-eme nnukwu mmemme dịka ili ozu, ịlụ nwanyị, ichi echichi, ọjị a naghị akọ ebe ahụ. Mana abịa n’ileta ọbịa, ndi mmadu na-enyezi ihe sọrọ ha. Mgbe ụfọdụ anaghị enye ihe ọ bụla; onye ahụ nọchaa ọlawa n’ihi na ewerela akụkọ mere ya ọjị.

Ugbu a, ndi Igbo na-achọzi ịnọrọ onwe ha; onye ọ bụla na-abụghị ikwu ma ọ bụ ibe, achọghị ha n’ihi na a na-ahụ ha dịka mmekpa ahụ.

Dịka onye Igbo, ịka na-anabata onye ọbịa?

Kedu ụdị ọjị ị na-enye ha?

 

 

Nwaada Amarachi Ọnụọra

 

4 Comments

  • Hi

    Buy medical disposable face mask to protect your loved ones from the deadly CoronaVirus. The price is $0.99 each. If interested, please check our site: pharmacyusa.online

    Best Wishes,

    ỌJI: ka esi eleta ọbịa mgbe mbu na otu ọ dị ugbu a | odumblog – odumblog.com

  • Hi there

    Body Revolution – Medico Postura™ Body Posture Corrector
    Improve Your Posture INSTANTLY!
    Get it while it’s still 50% OFF! FREE Worldwide Shipping!

    Get yours here: medicopostura.online

    Thank You,

    ỌJI: ka esi eleta ọbịa mgbe mbu na otu ọ dị ugbu a | odumblog – odumblog.com

  • Morning

    Be Buzz Free! The Original Mosquito Trap.
    60% OFF for the next 24 Hours ONLY + FREE Worldwide Shipping

    ✔️LED Bionic Wave Technology
    ✔️Eco-Friendly
    ✔️15 Day Money-Back Guarantee

    Shop Now: mosquitotrap.online

    Enjoy,

  • Hi

    Be Free from Neck Pain
    Try NeckFlexer & Relieve Neck Pain Effortlessly In 10 Min!
    Save 50% OFF + FREE Worldwide Shipping

    Shop Now: neckflexer.online

    ✅ Designed By Doctor & Chiropractor
    ✅ Ergonomic Design – Fits Everyone
    ✅ Circulation To Head
    ✅ Stimulating Key Result Area

    Best,

    ỌJI: ka esi eleta ọbịa mgbe mbu na otu ọ dị ugbu a | odumblog – odumblog.com

Leave a Reply