Igbo News

Ọhaneze ndigbo ekwuo uche ha maka ọchịchị ụlọ omeiwu

Views

Ọhaneze ndiigbo ekwuola ma gosi iwe ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke ụlọ omeiwu nke Naijiria. Ha sịrị ihe niile emere ebe ahụ bụ ụka akparaakpa iji megide ndi Igbo na ndi ọwụwa anyanwu niile. Ihe mere ha jiri kwuo ụdị okwu a bụ maka na o nweghi onye omeiwu si n’ọwụwa anyanwu ahọpụtara.

Ka emechara ntụli ndi ga-abụ ndi isi omeiwu, o nweghi nwaafọ Igbo ahọrọ, ebe ndi ahọrọ bụ ndi ọzọ sitere na mpaghara mba Naijiria ndi ọzọ.

Mazi Uche Achi-Okpaga bụ onye nkwuchite ọnụ Ohaneze sịrị na ọ bụghị ihe ịtụnanya nye ha n’ihi na onye nọ n’ala anaghi atụ ụjọ ada.

O kwukwara na ndi Igbo enweghi ihe ha na-atụ anya n’aka gọọmenti a, ebe ọ bụ na anaghị akwanyere ha ugwu. Ọ sịrị na ndi Igbo na-agbalị ime ọrụ nke dị ha n’aka mana gọọmenti Buhari na-eleli ha anya. Ọ gara n’ihu kwuo na ndi Igbo ga-anọrọ ọdụ kpebie ihe ga-abụ uche ha gbasara ọchịchị Naijiria n’ọdịnihu.

Leave a Reply