Igbo News

Ọhaneze akpọọla Buhari ka ọ rituo maka nzukọ ndi OIC ọ gara

Views

Ndi Ọhaneze ndi Igbo agwala Onyeisi ala Muhammadu Buhari ka ọ rituo n’ọchịchị ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ibu okpukpere chi n’isi.

Ka emechara emume iṅu iyi, Onyeisi ala Muhammadu Buhari hapụrụ Naijiria gawa Saudi Arabia maka nzukọ ‘Organization of Islamic Affairs (OIC). Ọhaneze Ndigbo site n’ọnụ onye na-enyere ode akwụkwọ ha aka bụ Chuks Ibegbu, mere ka amara na Buhari ji ndi Naijiria ụgwọ ịkọwara ha ihe bugara ya Saudi Arabia ka emechara emume ịṅụ iyi. Ha sịrị na kama ọ ga-ebute ogbaaghara maka okpukperechi, ya rituo n’ ọkwa ọchịchị.

Ndi Ọhaneze kwutekwara okwu banyere otu onye isi ndi ‘House of Representative’ bụ Femi Gbajabiamila, onye gara Mecca. Ha sịrị na ije ọ gara na Mecca egosighi ezigbo ebumnuche. Na ọ bụrụ na ọ gara Mecca ka o wee bụrụ onyeisi ụlọ nnochite anya, nke a apụtaghị ezigbo ihe n’ebe ọchịchị onye kwuo uche ya dị na Naijiria.

Ha siri na, ‘Femi bụ ezigbo onye otu Christi ịnọkata bụrụ onye Muslim maka ọchịchị egosighi ezigbo ebumnobi. Anyị enwere ike ịtụkwasị ụdị mmadu a obi?’.

Leave a Reply