FeaturedIgbo News

Ọhanaeze na-eru uju maka ndị ọkụ gbara n’Ọnitsha metụtara

Views

Ọhanaeze Ndigbo Youth Council kwuru na ha ga-eji ngwusi izu a ruo uju maka ndị tufuru ndu ha na ihe enwe enwe ha n’ọkụ a gbara n’Ọnitsha.

Otu a kwuru na ha na-enyocha ihe butere ọkụ ọgbụgba a n’Ọnitsha.

Ha kwuru na ndị ntorobịa ndị Igbo ga-apụta n’igwe iru iju maka ndị ọkụ ọgbụgba a metụtara n’Ọnitsha na Fraide, iri na asatọ, n’ụlọ alakụba niile dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ, nakwa Satọde, iri na itolu, n’ụlọ ụka Seventh Day Adventist niile dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ, nakwa na Sọnde, iri abụọ n’ụlọ ụka ndị ọzọ.

Otu a kwuru na ha na-atụ anya na ndị Igbo ga-etinye ndị a ọkụ ọgbụgba a metụtara n’ekpere ma na-arịọkwa gọọmentị etiti ka ha nyere ndị a aka site n’ibinye ha ego.

Ndị ntorobịa site n’ọnụ Onyeisi ha, Mz. Okechukwu Isiguzoro na Onye ode akwụkwọ ha, Mz. Okwu Nnabụike, kelere Onyeisi ala Muhammadu Buhari maka ịkwado ijeri naira iri maka ọdụ ụgbọelu Akanu Ibiam, Enugu.

Leave a Reply