Igbo News

Ọhanaeze agwala gọvanọ ndi South East ka ha kwadowa maka ndi si South Africa alọta

Views

Ọhanaeze Ndiigbo adụọla gọvanọ ndi mpaghara ọwụwa anyanwụ ọdụ ka mee nkwado zuru oke maka nlọta ndi ihe metụtara na South Africa.

Ọhanaeze kwuputara atụmatụ ha ịnabata ndi ụmụ ha ndi Igbo, ndi si South Africa alota, ndi gbara mbo iwulite akụnaụba nke ala Igbo na obodo Naijiria n’emume Igbo Day Celebration nke na-abịa n’ihu.

N’okwu nke ha gwara ndi nta akụkọ n’Abuja, Mz. Odozi Nwodo, onyeisi otu Ọhanaeze gosiri mwute ya maka mwakpo ndi Naijiria na South Africa tụmadị enyemaka ndi Naijiria nyeere ndi South Africa mgbe ha nwere nsogbu ‘Apartheid’.

Ọ gwara ndi gọvanọ a ka ha rụpụta akụrụngwa nke ga-enyere ndi a ihe metụtara aka.

Nwodo kwuru na ndi Ọhanaeze enweghi ego ha ga-eji enyere ndi a aka mana o doro ha anya na Gọọmentị etiti na nke steeti akwadola ihe ndi ga-eme ka ahụ doo ndi a na-alọtanụ.

Leave a Reply