Igbo News

Ogbunigwe egbuola mmadu atọ n’Imo Steeti

Views

Ogbunigwe gbara n’Eziorsu nke dị n’Imo Steeti ụbọchi Tọọzdee bụ abali nke isii n’ ọnwa Juun. Orlando Ikeokwu bụ onye uwe ojii kwupụtara nke a ma nyekwara aha mmadu atọ nwụrụnụ; ndi gụnyere: Elvis Ukado, Kasiemobi Uzoma na Justice Adie. Ndi a bụ ndi na-ere akpakara igwe n’ogbe ogbunigwe a dara.

Onye uwe ojii kowara na ogbunigwe a bụ nke dị n’ebe a na-edosa akpakara igwe. Mgbe ụmụokorobia a na-akụpịasi akpakara igwe ka ogbunigwe a gbara.

Onye nọ mgbe ihe mberede a mere kwuru na ọ metụtara ndi mmadu nọ n’akụkụ n’ihi ụdị ikuku ogbunigwe a buru. Egwu bara ndi mmadu n’ahu ka ha hụrụ akụkụ ahụ mmadu ka ọ na-efeghari.

Ndi uwe ojii jikwa ohere a dọọ ndi mmadu aka na nti ka ha gbaa ama ihe ọ bụla ha hụrụ dịka ogbunigwe ka e nwee ike nyochaa ya nke ọma ma gbohie ihe ndakwasi di otu a.

Leave a Reply