FeaturedIgbo News

Ogbunigwe agbarie Ụlọ odeakwụkwọ ndị All Progressive Congress  n’Edo

Views

Ogbunigwe adaala n’ụlọ onye odeakwụkwọ ndị All Progressive Congress  n’Edo nke aha ya bụ Mazị Lawrence Okah.

Dịka ndị thenationonline siri kọwaa, Ogbunigwe a gbara ka o jiri ọkara gafee elekere iri na abụọ nke etiti abalị (12. 30am) na Tuzde.

Ndị uweojii na-ahụ maka ogbunigwe biara ebe elekere asatọ nke ụtụtụ (8am) mere ka a mata na Ogbunigwe a gbariri akụkụ ụlọ ahụ ma gwuo ala na ya.

Ka o siri dị ugbu a, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ APC, Edo dịka Osagie Ize-Iyamu, Dkt. Pus Adubu, agaala na nke Mazi Lawrence Okah ịkasi ya obi maka ya bụ ihe mberede.

Leave a Reply