FeaturedIgbo NewsLifestyle

ỌDAA OPUO AGBAA AFỌ IRI ATỌ NA ISII (36)

Views

Ekele dịrị Chukwu Nna onye okike kere Ọdaa Opuo dịka ya bụ nwa amadi Hon. Johnbosco Akaegbobi na-eme emume ncheta ọmụmụ ya taa bụ ụbọchị iri abụọ na itoolu(29th) n’ọnwa Ọgọọstụ, nakwa emume agbamakwụkwọ ya gbara afọ anọ.

Hon. Akaegbobi, onye dị afọ iri atọ na isii, bụ ide nke na-akpa ike na obodo. Nwokorobia a bụ onye omeiwu, onye ji egwu Chineke arụ ọrụ ma na-efe ndi ahanyere ya n’aka.

Hon. Johnbosco Akaegbobi, onye a na-akpọ Ọdaa Opuo, bụ onye otu ụlọ omeiwu nke Anambra, onye na-anọchị anya mpaghara Nnewi South.

Tụpụ o merie na ntuli, Hon. Akaegbobi so n’otu ndi nwere nnukwu onye ọrụ ugbo n’Anambra Steeti nakwa na South East niile. O nwere ndi ọrụ karịrị mmadu iri asaa; ndi na-arụ ugbo ọkụkọ, azụ nakwa ezi n’Ụkpọ, Nnewi South LGA. Ọrụ ugbo bụ ọzụrụ ụmụ ogbenye maka na ndi mmadu esila na ya zụọ ezinaụlọ.

Odogwu a nwekwara ụmụ akwụkwọ iri isii na atọ, ndi ọ na-azụ n’akwụkwọ kwa afọ. N’afọ a, ọ kwụọla ndi nkuzi nọ na mpaghara Nnewi South ụgwọ.

N’erubeghi ọnwa atọ ọ banyere n’oche ọchịchị, o meela ka anya gọọmentị ruo na ụlọ ọgwụ nke Ụkpọr. Otu ọ dị, o mere ka Hon. Vincent Okpala, Kọmishọna nke Health, bia hụ ọnọdụ ụlọ ọgwụ a, ma chọọ ụzọ e si emezi ihe mebiri emebi.

Hon. Akaegbobi kwenyere na onye ọ bụla kwesiri inwe aka ọrụ, nke mere o jiri wepụta ebe ndi mmadu na-amụ aka ọrụ. o kwenyere na inwe aka ọrụ ga-ebelata izu ohi na enweghi ọrụ.

Hon. Johnbosco Akaegbobi bụ onye Ụkpọr nke dị na Nnewi South LGA nke dị n’Anambra Steeti. Ọ natara nzere ya na ngalaba Industrial Chemistry na Enugu State University of Technology (ESUT). Ka o fechara ala nna ya, ọ gara United Kingdom, ebe o nwetara nzere Masters ya na Waste Management and Environmental Studies. O natakwara nzere na akụkụ mmụta ndi ọzọ dịka Public policy, Entrepreneurship na administration.

Dịka ọ na-eme emume ncheta ọmụmụ ya nakwa emume agbamakwụkwọ afọ anọ ya, ka Obinigwe gozie ya ma nye ya ndu n’elu ndu ka o nwe ike ịrụ ọrụ nke aghanyere ya n’aka.

Leave a Reply