FeaturedIgbo News

Ọchịchị Ikpeazụ ebutela agụrụ n’Abia: Alex Otti

Views

Alex Otti, onye zọrọ gọvanọ n’okpuru All Progress Grand Alliance, 2019, n’Abia Steeti, emeela ka a mara na ọchịchị Okezie Ikpeazụ ebutela agụrụ na ụbịam na steeti ahụ.

Otti kwuru nke a na mgbede Sọnde; ebe onye enyemaka ya n’ihe gbasara mgbasaozi mere ka o rute ndị nta akụkọ ntị.

Otti kwuru na o nweghi eziokwu dị n’ọchịchị Ikpeazu nakwa na ihe gbasara ndị ọ na-achị anaghị emetụ ya n’ahụ.

O kwuru na n’agbanyeghị ego niile gọọmentị etiti nyere steeti maka mwulite obodo nakwa ịkwụ ndị eji ụgwọ ego ha, Okezie Ikpeazụ ekpebiela ịla ndị mmadụ n’iyi.

O kwukwara na ọ natara mkparị n’aka Ikpeazụ mgbe ọ gara ụlọikpe maka ikpe ntụli 2019 ya na INEC nwere. O kwuru na Ikpeazụ kwụrụ ndị mmadụ ụgwọ; ndị a wee were egwu ha na-akparị ya.

N’otu aka ahụ, o kwukwara na ndị e ji ụgwọ mere ngagharị iwe maka ụgwọ e ji ha kemgbe ọnwa iri atọ na abụọ n’otu ụbọchị ahụ. O were na-ajụ, ‘onye na-aghọgbu ibe ya?’

Otti chetakwaara ndị mmadụ nkwa Ikpeazụ kwere mgbe emere emume afọ iri abụọ na asatọ nke Abia Steeti. Ikpeazụ kwuru na tụpụ ọchịcha agba nke abụọ, na ọ ga-arụcha ọrụ niile o ji n’aka. Ma ka ọ dị ugbu a, kedụ ebe asụmasụ gbabewere ọdụ?

Leave a Reply