FeaturedIgbo News

ỌCHỊCHỊ BUHARI DỊKA ABỤMỌNỤ NYE NAỊJIRỊA- OYEDEPO

Views

Ụka agbasaala ka onyeisi ma bụrụ onye nlekọta Living Faith Church Worldwide, nke e jikwa  Winners Chapel mara, bụ Bishop David Oyedepo tinyere ọnụ n’ọnọdụ ọjọọ Naịjiria nọ n’ime ya. O mere ka a mara na ọchịchị onyeisiala Buharị kacha njọ kemgbe e jiri chịba ọchịchị na Naijiria.

 

N’oziọma ya ụbọchị ụka na Faith Tabernacle, Ota Ogun steeti, o kwuru na ụbọchị onyeisiala n’ọkwa ọchịchị ya abịawala n’isi njedebe.

Ọ gara n’ihu kọwaa Buhari ka onye ọjọọ nke ọchịchị ya enweghi usoro nduzi ma dịkwa ka abụmọnụ nye Naịjiria. N’okwu nke ya, Oyedepo sịrị; ”a sị m kwuo, ị kwesịghị ịbụ onyeisiala n’ihi na ị bụghị ezigbo mmadụ. Enwere m ikike ikwu ya maka na abụ m nwa afọ Naịjirịa maara ihe ekwe n-akụ.”

”N’uche m, ọchịchị Buhari bụ ihe kacha njọ dakwasarala Naịjirịa, ọ dịzi ka abụmọnụ.”

Leave a Reply