FeaturedIgbo News

Obianọ egosila mwute gbasara ọkụ gbara n’Ọnitsha

Views

Gọvanọ Anambra Steeti, Willie Obianọ, egosila obi ọmiiko n’ezinaụlọ nne na nwa ọkụ gbagburu na ihe mberede nnukwu ụgbọala, n’Ọnitsha.

Obianọ enyela ntuziaka ka ndị ihe mberede a metụtara ga na Conference Room na Mọnde, ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, ka gọọmentị steeti nyere ha aka.

Ihe mberede a mere na Wensede, mgbe nnukwu ụgbọala bu premium motor spirit, danyere n’olulu were nwufusia mmanụ ọkụ o bu, nke mere ọkụ ji bido gbawa.

Ndị Anambra State Fire Service bịara ebe ahụ mana ha akwụsịnwughi ọkụ a, n’ihi na ndị mmadu ekweghi ha gafere. Ndị si Delta bịakwara mana ahụghị ke emere.

Kọmishọna ozi nke Anambra steeti, Don Adinụba kwuru na ewepụtala otu ga-enyocha ihe butere ihe mberede a, ihe mere ndị mmenyụ ọkụ emenyụnwughi ọkụ ahụ na otu a ga-esị belata ọnọdụ ndị mmadu ma nyere ha aka.

Gọvanọ kpere ka mkpuru obi nne na nwa nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba zuo ike na ndụkwa. O kwukwara na ọ ga-enyere ndị ezinaulọ ha aka maka olili ha.

 

Leave a Reply