FeaturedIgbo News

Ụlọọrụ Multichoice na MTN eberela na mgbagbu

Views

Otu National Association of Nigeria Students ekwuola na ha ga-egbu ndi South Africa ato bi na Naijiria mgbe ọ bụla egburu otu onye Naijiria na South Africa. Nke a bụ maka mwakpo na mmegbu ndi Naijiria na-enweta na South Africa.

NANS kwukwara na ha ga-emebi ahia ndi South Africa atọ na Naijiria mgbe ọ bụla emebiri ahịa onye Naijiria bi na South Africa.

Onye otu a na-ahụ maka ọha, Azeez Adeyemi, kpughere nke a mgbe ha na-eme ngaghari iwe n’Abeokuta, Ogun Steeti.

Ụmụakwụkwọ ndi a mgbe ha na-eme ngaghari iwe, mechiri ụlọ ọrụ Multichoice na MTN. Ha bukwa asambodo edere ihe dika: ‘Killing of Nigeria by South Africa must stop’. ‘Enough is Enough’ na ihe ndi ọzọ.

Ha kwuru na oge igba nkiti agaala, n’ihi nke a, ha kwuru na ihe ọ bụla ndi South African mere, ha ga-enweta mmegwara ya.

Leave a Reply