FeaturedIgbo News

Obi dị m ụtọ na nlọta mụ – Aisha Buhari

Views

Nwunye Onyeisi ala Muhammadu Buhari, Aisha Buhari, ruru Naijiria n’isi ụtụtụ Sọnde.

Site n’okwu nke onye nkwuchite ọnụ, Suleiman Haruna, Aisha ruru Ọdụ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe, Abuja, mgbe o ji ọkara gafee elekere nke anọ.

E kwuru na Aisha kwuru na obi dị ya ụtọ na nlọta ya dịka o nwetachara ezumike ka kwesịrị. O kwukwara na o nwetala ike iji bido ebe ọ kwụsịrị maka imezi ndu na ahụike ụmụnwanyị, ụmụaka na ndi ụwa na-atụ n’ọnụ.

Ndị nabatara ya n’ọdụ ụgbọelu gụnyere ndị nwunye gọvanọ steeti, ndị enyi na ndị ikwu na ibe.

O jiri ohere a kelee di ya, ndị ikwu na ibe na ndị enyi maka nkwado na agbamume.

Leave a Reply