Igbo News

Obasanjo ekwuputala mwute ya maka ụmụaka na-anaghi aga akwụkwọ

Views

Onyeisi ala chịbụrụ Naijiria bụ Olusegun Obasanjo kwuru na Tọzde na o wutere ya ka ọnụọgụgụ ụmụaka na-anaghị aga akwụkwo si abawanye n’obodo. O kwuru nke a mgbe gọọmentị etiti kwupụtara na a ga ebido ‘open school programme’ n’ọnwa Julai ka enwe ike igbo mkpa nke ụmụaka na-anaghị aga akwụkwọ.

Ọzọkwa, mgbe Olusegun na ndi National Youth Council of Nigeria nwere nzukọ n’Olusegun Obasanjo Presidential Library, ọ gwara ndi ntorobia na ekwesiri ka a na-ahụta ha dịka ndi ọchịchị nke taa na-abụghị nke echi.

Ọ gara n’ihu kwuo na obodo a kwesiri itinye ndi nkuzi n’ọrụ ka o nwee ike ikpali mmuo ndi mmadu ka ha tinye uche n’ọrụ nkuzi. Ọ gwara ndi ntorobia ka ha bilie ma maa ọchịchị obodo a aka n’ihu. O kwuru na e kwesiri inye ha ohere ka ha gosi ihe ha nwere.

Leave a Reply