Sports

O wuterem na anyị emerighi Super Eagles: Paul Put

Views

Onye nlekọta otu egwuregwu Guinea egosila nwute ya maka mmeri otu Super Eagles meriri ha.

Paul Put kwuru na ndi otu egwuregwu ya gbalịrị nke ọma kama na ha enweghi ihu ọma ụbọchị ahụ. O kwukwara na ọ bụ n’ihi elezighi anya ndi otu ya mere ndi Super Eagles jiri nye otu goolu nke ha jiri merie ha. O kwuru na ọ bụ ihe di ike inabata.

Otu Super Eagles jiri otu goolu nke a na-asaghị asa merie ndi Guinea; nke Kenneth Omeruo jiri isi nye. Ugbu a, otu mba Guinea ga-agbalị merie mba Burundi ma ọ bụrụ na ha ga-aga n’ihu na nsọmpi a.

Leave a Reply