Sports

O nweghi ihere dị na mmeri a: Rohr

Views

Onye na-achịkọta ndi Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na o nweghi ihere dị na mmeri Madagascar meriri ndi Nigeria. Ụnyahụ bụ ụbọchị iri atọ nke onwa Juun ka Naijiaria na Madagascar gbara bọọlụ na asompi nke Iko Mba Afrika a na-agba n’Ijipt.

Goolu nke Lalaina Nomenjanahary na Carolus Andriamahitsinoro nyere mere ka Madagascar nye Naijiria ọkpụ goolu abụọ. Nke a mere ka Madagascar bụrụ ndi nwee mmeri n’otu B.

Rohr kwupụtara na ndi nke ya emeghi ọfụma mana ihere adịghị na ya n’ihi na ndi Madagascar bụ ndi maara ka esi agba bọlụ. O kwukwara na ndi otu ya ji nwayọọ were gbaa bọọlụ maka na ha alaferela.

Mana o kwuru na ndi Super Eagles ga-etinye uchu ịhụ na ha meriri ndi Ghana na asọmpi na-abịa n’ihu.

Leave a Reply