FeaturedIgbo News

O nweghi ihe ga-eme ka akwụsị iwu soshal media – Lai Mohammed

Views

Gọọmentị etiti ekwuola na nkatọ ndị mmadu agaghị akwụsị atụmatụ ha iwepụta iwu nke soshal midia. Minista nke ozi na omenaala, Lai Mohammed kwuru nke a na Tọzde, mgbe o zutere ndị Guild of Corporate Online Publishers n’Abuja.

O kwuru na mba ndị ọzọ dịka Germany, UK, China, Uganda, Kenya, dgz, nwere iwu na-egbochi ụfọdụ ihe na soshal media.

Ọ gwara ọhanaeze na e bidola usoro ihibe iwu a. O kwuru na e zigarala ndị mmadu na ụlọọrụ akwụkwọ ozi maka nzukọ ha ga-enwe.

O kwuru na iwu ga-egbochi okwu ụgha na okwu na-ebute esemokwu.

Leave a Reply