FeaturedIgbo News

NYSC ekwuola na onye na-efe ala nna ya egbughi nwa Almajiri

Views

Onye nchịkọta National Youth Service Corps (NYSC) na Kano, Alhaji Ladan Baba, kwuru na akụkọ a na-egbughari na soshal media nke gbasara onye na-efe ala nna ya na Bebeji LGA nke steeti ahụ; onye e kwuru kụgburu nwa Almajiri, abụghị eziokwu.

Onye nchịkọta NYSC kwuru nke a n’akwụkwọ ozi o binyere aka ya ma nye ya ndị News Agency of Nigeria (NAN) na Friade, na Kano.

O kwuru na nwata nwoke a nwụrụnụ, Hassan Suleiman gara n’ụlọ ndị Kọpa ịhọrọ mkpụrụ osisi, mana onye Kọpa a, Jepthan Peter Makwin bidoro chụwa ya ọsọ.

Mgbe nwata a na-agba ọsọ, ẹ dara ada ma kụọ isi ya n’osisi. E bugara ya ụlọ ọgwụ mana ọ nwụrụ n’oge n’adịghị anya.

Ladan Baba kwukwara na ndị uwe ojii ka na-enyocha okwu a, ebe a ka jichiri nwokorobia na-efe ala nna ya.

O kwukwara na ya na ndị Kọpa ndị ọzọ a gala leta ezinaụlọ nwa Almajiri a.

 

Leave a Reply