FeaturedIgbo News

Nwoke na-alụ nwanyị anwụọla ebe a na-eri oriri agbamakwụkwọ n’Ebonyi

Views

Ihe ọjọọ mere na Amasiri nke dị n’Afikpo North LGA, Ebonyi steeti, na Satọde, ka onye na-alụ nwanyị, Chukwuemeka Ọnwụka, dara na-ebe a na-eri oriri agbamakwụkwọ ya, were nwụọ mgbe e bugara ya ụlọọgwụ.

Ọnwụnka ka e kwuru na ọ na-alụ otu nwaada Onyinyechi Amadi Ugbor, onye bụ onye Amasiri.

Onye akaebe ndị Punch Metro gbara ajụjụọnụ kwuru na mgbe nwoke a na nwunye ya na-agba egwu ne ugboro abụọ n’emume a mgbe nwoke a dara ma gbọpụtawa ọfụfụ n’ọnụ ya.

O kwuru na ndị mmadu kuputara nwoke n’ezi ma na-efe ha akupe. Ma mgbe ha hụrụ na nke a akarịala, ha kpọọrọ ya gawa ụlọọgwụ.

Mgbe ha rutere n’ụlọọgwụ dị ha nso, dọkịta nọ ebe ahụ gwara ha ka ha buga ya Mater Hospital, Afikpo. Ma tụpụ ha erute ụlọọgwụ a, ọ bụrụ na nwoke a anwụọlari.

 

 

Leave a Reply