FeaturedIgbo News

Nwoke bụbu Onye kọpa egwuola ndị mmadu wayo nde naira iri ise na abụọ

Views

Ndị uwe ojii Federal Capital Territory anwụchiela otu nwokorobịa dị afọ iri abụọ na asaa, onye fere ala nna ya n’oge gara aga, Muhammed Bello Kolo. A nwụchiri nwoke a n’ihi na o kwuru na ọ bụ  Minista nke FCT ma gwuo ndị mmadu wayo nde naira iri ise na abụọ.

Ndị uwe ojii kwuru na ndị nwụchiri nwoke a sị na State Intelligence Bureau maka mkpesa ha nwetara gbasara ya n’Ọktober, ụbọchị iri abụọ na asatọ.

Ihe ndị a natara nwoke a gụnyere: ụgbọala Peugeot 206, keke, ihe onyonyo Samsung, igwe eji asa akwa na ihe ndị ọzọ. Muhammed kwuru na ọ bụ ego o gwutere na wayo ka o jiri zụọ ihe ndị a.

Ndị uwe ojii kwuru na a na-achọ ndị ha na Muhammed na-arụkọ ọrụ; Simon na Idris, ndị kwuru na ha bụ Director of Procurement na Personal Assistant n’otu n’otu.

Leave a Reply