Igbo News

Nwanyị ahapụla nwa ọhụrụ ọ mụrụ

Views

Nne nwa nke a na-amaghị anya ya bụ onye hapụrụ nwa nwanyị ọhụrụ ọ mụrụ n’ụlọ ọgwụ dị n’Osumenyi dị na Nnewi South nke Anambra Steeti. Ndi dọkịta na nọọsụ kwuru na nwanyị a hapụrụ nwa ya ka ọ mụchara ya na Monde ụbọchị iri nke ọnwa June, 2019.

Onye na-ekwuchite ọnụ ndi uwe ojii bụ Haruna Mohammed ekwuola na ha na-akwado ịkpọga nwata ebe ndi gọọmenti na-edosa ụmụ na-enweghi nne na nna. O kwukwara na ha na-agbalị ịhụ na ha jidere nne nwa ahụ ma gbapuo ya ntị maka ihe ọjọọ o mere.

Leave a Reply