FeaturedIgbo News

Nwaneku agbanyere Nne ya ukwu ọtapịapịa na Mmiri ọṅụṅụ (Video)

Views

Otu nwata nwaanyị na-enyere nne ya ukwu aka agbanyerela nne ya ukwu ọtapịapịa e ji ‘SNIPER’ mara na mmiri ọṅụṅụ iji gbufuo ya.

A nụrụ ka Nne ya ukwu na-ajụ nwata nwaanyị a ihe mere o jiri chọọ inye ya ọtapịapịa n’otu onyoonyo dị na Instagram.

N’onyoonyo a, nwaneku a sekpu ala, ebe nne ya ukwu na-agba ya ajụjụ ọnụ banyere ihe o mere.

Gụọ: Ụgbọala bu Mmanụ Petrol adaa n’Abule Egba, Lagos

Ndị nta akụkọ Odumblog chọpụtara na aka kpaara nwata nwaanyị a ka ọ gbanyechara ọtapịapịa a na mmiri ọṅụṅụ nne ya ukwu.

Nwaneku a nke e meghi ka a mara aha ya, kwuru na ọ bara n’ime ụlọ nne ya ukwu ga-gbanyere ya  tụsa tụsa na mmiri ọṅụṅụ.

 

 

Leave a Reply