FeaturedIgbo News

Nwagbọghọ dị afọ iri abụọ na atọ ezurula ụgbọala na ihe enwe enwe ruru otu nde naira

Views

Ndị uwe ojii nke Ikeja Police Station anwụchiela otu Nwaada Deborah Nwachukwu, nwagbọghọ dị afọ iri abụọ na otu, onye zuru ụgbọala, ego na ihe enwe enwe ruru otu nde naira.

DSP Bala Elkana nke Lagos State Ploce, gwara ndị nta akụkọ nke a na Sọnde.

Elkana kwuru na nwaada bụ nwafọ Abia steeti, onye bi na 19 Irewale, nke dị n’Ipade, Lagos steeti.

Ọ kọwara na Nwachukwu zuru ụgbọala, ekwentị abụọ, ego na ihe ndị ọzọ, n’ụlọ otu Mz. Patrick, onye bị na MKO striiti.

Patrick hụrụ Nwachukwu na Shoprite nke dị n’Ikeja, ebe ọ na-ere ihe ndị e ji ehicha ụlọ. Mz. Patrict kpọrọ ya ka ọ bịa hichara ya ụlọ ya. Ha kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ya puku iri abụọ.

Nwachukwu kwuru na ọ bụghị naanị ihichaa ụlọ ka nwoke a kpọrọ ya. O kwuru na ha nwere mmekọahụ.

Ka ha nwechara mmekọahụ, nwaada a kpokọrọ ihe ndị aka ya ruru mgbe ọ chọpụtara na nwoke a na-ehi ụra ma gbalaga.

Otu ọ dị ugbu a, akpọpụla nwaada ụlọikpe.

 

Leave a Reply