FeaturedGossips

Nwaanyị atụfuo ejima ọ mụrụ ọhụrụ na Port Harcourt

Views

Arụ mere ụbọchị Mọnde na Portharcourt ka ndị mmadụ hụrụ ụmụ ejima amụrụ ọhụrụ atụnyere n’ime ọwa mmiri. Akụkọ na-abịara anyị mere ka amata na ọ bụ otu nwagbọghọ tụtara ime ajụrụ ajụ bụ onye nke mere ihe obi mgbawa a. ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na ọtụtụ di na nwunye amụtabeghi nnwa, ma ya fọdụ nke e mere ntụfu.

Onye ntaakụkọ anyị wetere ozi a mere ka a mara na tupu ndị mmadụ a na-agbakọ na Rukpuokwu ebe a hụrụ ụmụaka abụọ a, ya bụ ụmụaka anwụọla.

Ndị uweojii na ọhammadụ etnyela anya n’ala ịchọpụta onye mere nke a.

Leave a Reply