FeaturedGossips

Nwa Akwụkwọ Oko Poly atụfuo nwa ọ mụrụ ọhụrụ

Views

A hụla ma kutuo nwa a mụrụ ọhụrụ dakooro n’elu ugboaja n’ebe obibi ụlọkwụkwọ Oko Ploytechnic  dị n’ Orumba South, Anambra steeti. Ka ọ dị ugbua, nwa a a mụrụ ọhụrụ bụ nnwa nwaanyị ka dị ndụ na-anara ọgwụ na Chukwunonso Specialist Hospital, nke dị n’okirikiri ebe ụlọakwụkwọ Oko Poly.

A na-anụ kepu kepu na ọ bụ n’ụlọelu dị n’ụlọakwụkwọ a ka nne ya, onye nke amabeghi aha ya siri chọrọ itufu ya bụ nnwa ka ọ mụchara n’ụlọobibi enyi ya nwoke dị n’ụlọobibi ụmụakwụkwọ.

Chinonso Nwosu, dibia oyibo nọ n’ụlọọgwụ a kpọgara ya bụ nnwa mere ka amata na ahụ zuru nwata ahụ oke, kama na o merụrụ obere ahụ n’ụkwụ ebe o koro na waya n’ugboaja.

Ọ gara n’ihu mee ka a mara na ka ihe a mechara, na nne mụrụ nnwa ahụ ma bụrụ onye kụrụ ome a na-achọ kemgbe na-enye ya bụ nnwa ara dịka akpụtachara ya n’ụlọọgwụ.

Ndị The Nation Online mere ka a mara na onye kụrụ ome a bụ enyi nwa akwụkwọ HND, Public Administration,Oko Polytechnic, onye nke nyere ya ebe obibi ya ka ọ nọrọ mụọ nnwa.

Onye mgbasaozi ndị Oko Poly mere ka amata na odoghi ha anya ma onye mere ya bụ arụ abụ nwa akwụkwọ ha ka obụ na ọbụghị.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii ogbe ahụ bụ Haruna Mohammed mere ka a mara ka a jụrụ ya, na ha etinyela ụkwụ na mmiri, iji chọpụta ka mmiri siri baa ya bụ opi ụgbọgụrụ.

5 Comments

Leave a Reply