FeaturedGossips

Nwa akwụkwọ FUTO chọrọ igbu enyi ya n’ihi ego yahoo

Views

Chi bọọ. anụ ọzọ bụ ọnọdụ Naijiria ugbu a. Nwata akwụkwọ nke Federal University of Technology Owerri (FUTO) nke na-agụ Biological Sciences ka e jidere ebe ọ na-achọ iji nwata akwụkwọ ibe ya agwọ ọgwụ (yahoo plus).

Ihe a mere na ebe obibi ha a na-akpọ Bliss Mansion nke nọ n’Ụmụchịma, Owerri. O kwuru na ihe mere o jiri chọọ ime ihe dị otu a bụ ka ‘Yahoo business’ ya nwee ike na-aga nke ọma.

N’ịkọwa otu ihe siri mee, onye akaara iji agwọ ọgwụ ego a nke a na akpọ Daniel kwuru na enyi ya nwoke kpọrọ n’abalị rịọ ya ka ọ bịa hie na nke ya n’ihi mmekọrịta ya na ndi uwe ojii nwere. Daniel kwuru na mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ime uchichi, enyi ya biakutere ya n’akwa ya, gwa ya ka egwu o na-akpọ ekwegi ya hie ụra.

Ka anọtụrụ nwantinti oge, enyi nwoke Daniel bidoro ibeku ndi mmuo. Na mbu, Daniel chere na o na-egwu egwuregwu mana mgbe o doro ya anya na ugo eberela na mmagbu bụ mgbe ọ jụrụ ihe mere o hibeghi ụra. Daniel gwara ya na mgbe ọ bụla ụra jiri tụọ ka ọ ga -arahụ ụra; mana n’ime obi Daniel, ọ na-ekpe ekpere.

Mgbe ọ kụrụ elekere abụọ nke ụtụtụ, o bidoro kụwa Daniel ihe. Ma ọ gwara Daniel na o nweghi onye ga-anụ olu ya mgbe Daniel bidoro iti mkpu. Mgbe o jiri ọkara gafee elekere abụọ nke ụtụtụ, ndi agbataobi pụtara bịa zọpụta ya. Daniel kwuru na ọ bụ amara Chineke mere o jiri nwee ike igbape ụzọ.

Lee akụkọ a n’ihe onyonyo:

https://zenithnaija.com/yahoo-plus-futo-student-nabbed-while-trying-to-use-his-colleague-for-ritual/

Leave a Reply