FeaturedIgbo News

Nsogbu Naịjiria abụghị ndị Shi’ites: IMN

Views

Ndị Islamic Movement in Nigeria, ndị amara dịka Shi’ites, aṅuọla iyi na ha ga-ebuso Buhari agha maka mmegbu na ogbugbu ndị mmadụ n’okpuru ọchịchị ya.

IMN kwuru na ha ga-eme ihe niile dị n’aka ha iji hụ na ha nwetara ihe ruuru ha.

N’okwu nke ha gwara ndị Daily Post na Sọnde, ha kwuru na Buhari enyela onyeisi ndị uweojii iwu ka anwụchie ndị otu ha na ndị isi ha nakwa ka emebisia ngwa ọrụ ha niile na steeti Naịjiria.

Ha kwukwara na kemgbe Buhari banyere n’oche ọchịchị na 2015, ọ na-eji ọnwa mbụ nke kalenda alakụba egbusisi ndị otu IMN ma na-egbochi ha ime ihe ha kwesịrị ime dịka okpukperechi ha siri chọ.

N’ime ka nke a kwụsị, ha ji ohere akpọku otu mba ụwa ndị ọzọ nakwa ndị Naịjiria ka ha mara na nsogbu Naịjiria abụghị ngagharị iwe maka El-Zakzaky, kama ọ bụ oke ntọrọ mmadụ, mwakpo na ogbugbu ndị mmadụ na Naịjiria, ọ kachasị n’ugwu.

Ha kwuru na IMN abụghị otu na-eyi egwu. O nweghi ihe ha na-eme, dịka okpukperechi ha siri chọ, nke na-eyi egwu.

Ha kwuru ka Naịjiria were ume na obi e ji achụ ha maka okwukwe ha, chụwa ndị na-egbusisi ndị Naịjiria.

Ha kwuru na ha bụ ndị na-eso ụzọ nwa nwa Prophet Mohammed, Imam Hussein; ya mere o nweghi onye ga-akwụsị ha ime ihe ọ bụla okpukperechi ha chọrọ.

Leave a Reply