Igbo News

Nsogbu Ihedioha tinyere onwe ya maka ibuso Okoroocha agha

Views

Uche Nwosu bụ onye zọrọ ọchịchị gọvanọ Imo Steeti n’okpuru ‘Action Alliance (AA) na ntliaka 2019, ekwuola na Gọvanọ Emeka Ihediọha enweghi ezigbo ebumnobi banyere ndi Imo Steeti. Ihedioha bụ gọvanọ ndi Imo steeti ugbu a kwechiri na Rochas Okorocha bụ gọvanọ chiburu steeti Imo enyefeghi ya ihe gbasara Imo steeti otu o kwesiri. Agwa a Ihedioha kpara mere Uche Nwosu jiri ụdị okwu a.

N’okwu nke ya,Uche siri: ‘Akparamagwa Gọvanọ Imo kemgbe o jiri rigoro n’oche ochichi egosighi na o nwere ezi atụmatụ gbanyere ndi Imo Steeti. Ndi Imo Steeti. naanị ihe o na-eme bụ ị chọọ ụzọ ọ ga-esi kwatuo Rochas. Nke a abụghị ihe ndi Imo Steeti jiri họpụta ya’.

O kwukwara na ịkwụsị ndi isi oche local gọọmentị na ndi ọzọ na-arụrụ gọọmentị ọrụ egosighi otu gọọmenti nwere ezigbo ebumnuche ga-esi bido ọrụ ya.

Uche Nwosu gwara Ihedioha ka o lekwasi anya na ọchịchị maka na ọ bụrụ na ya bụ gọvanọ, ọ ga-etinye uchu n’ihe diri ya maka na ọrụ a ga-arụ karịrị.

Leave a Reply