FeaturedIgbo News

NSCDC achụọla onye ọrụ eboro ebubo igbu mmadu

Views

Ụlọọrụ Nigeria Security and Civil Defence (NSCDC) n’ụbọchị Wenezde ekwuola na otu onye n’ime ndi ọfisa, onye aha ya bụ Innocent Oshemi bụ onye gbagburu ọfisa ọzọ na otu onye obodo Korea. N’ihi nke a, a chụọla nwoke a n’ọrụ NSCDC.

Abdullahi Gana, onyeisi ụlọ ọrụ kwuru na ha enyefela Innocent n’aka ndi uwe ojii. O kwuru na Innocent gbagburu onye Inspector nke a na-akpọ Mamman Wuya na otu onye obodo Korea na Samsung Heavy Industries na Lagos.

O kwuru na Innocent bụ onye ihe onyoonyo nke a na-akpọ Closed Circuit Television (CCTV) gosiri ebe ọ nọ mee omume a.

O gosiri mwute ya maka omume a, ma kwuo na ha ga-eme ihe ha kwesiri ime ka ụdịrị ihe hapụ ime ọzọ.

Leave a Reply